Kedụ etu e si awa ọjị n'ala Igbo?

Kedụ etu e si awa ọjị n'ala Igbo?
Mgbe e biputara ya

Ọjị bụ mkpụrụ osisi bara nnukwu uru n'omenala ndị Igbo.

Ọ bụghị naanị ihe a na-ata ata, kama ọ bụ mkpụrụosisi na-egosi nnabata, nkwanye ugwu, ịdị n'otu na udo.

N'ala Igbo, a na-ewere oji dịka ihe dị nsọ nke na-ejikọta mmadụ na mmadụ. Ọ bụ ya mere a na-eji ya anabata ọbịa, eme emume dị iche iche ma na-ekpe ekpere maka ndụ, ahụike na ọganihu.

Ndị Igbo na-ekwukarị sị, "Onye wetara oji wetara ndụ," nke na-egosi nnukwu mkpa na ugwu e nyere oji n'omenala Igbo.

Ọjị bụ otu n'ime ihe kacha dị mkpa n'omenala Igbo. Ọjị abụghị sọ nri, ọ karịrị nri.

Ọ bụ akara nkwanye ugwu, akara nkwekọrịta, akara ọdịnala, akara ngozi na ọganihu ndị Igbo.

Mana ọ bụ onye ọbụla nwere ike ịgọzi ya ma ọ bụ ịwa ya?

Bịa mụta usoro e ji egozi ọjị ma ịwa ọjị.

N'ọtụtụ obodo n'ala Igbo, onye pekarịrị mpe ga-eburu ọjị nye onye kacha okenye n'ọgbakọ. Ọ bụ onye kacha okenye a ga-egozi ọjị.

N'ọtụtụ obodo n'ala Igbo, onye pekarịrị mpe ga-eburu ọjị nye onye kacha okenye n'ọgbakọ. Ọ bụ onye kacha okenye a ga-egozi ọjị.

Ọ bụ nwoke nke nta ka a na-enye ọrụ ịwa ọjị mana ọ dịrị onye chiri nze ma ọ bụ ozo iwa ọjị ma ọ bụrụ na onye ahụ nọ n'ogbakọ.

E kwesiri iji akara dị n'ọjị ịwa ya, o kwesịghị ka e ji mma ịwa ọjị. Oge a wara oji, ọnụ ọgụgụ mkpụrụ ya wara nwerekwara ihe ọ na-anọchi anya ya.

Oge a na-eke ọjị, onye kacha nta n'etiti ụmụ nwoke ga-ebu ụzọ were ya bụ ọjị.

Onye kacha nta were, enye ya onye ọ na-eso ruo n'aka onye kacha okenye.

Ugbua, ma nwaanyị, ma nwoke ga-eso were ọjị.