You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye nwere nkwarụ kwesịrị inwe aka ọrụ ka agụụ ghara ịgụ ya - Chidimma Obilor
Chidimma Obilor bụ onye Ọhaji/Egbema n'Imo Steeti ma bụrụkwa onye amara dịka onye anaghị m agba onye ikpeazụ n'egwuruegwu ọbụla ọ nọ n'ime ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC News nnwere ka o "O teela m malitere, ma ụnụ amaraala na m bụ onye na-erite ọla. N'okpuru ọchịchị ime obodo m, ọ bụ Nwaanyị Ọlaedo 'Miss Gold' ka a na-akpọ m," ka o kwuru.
Ọ gara n'ihu kọwaa etu o sir nwete onwe ya n'ọnọdụ ya: "Oge amụrụ m, amaghị m... ndị nwe m kọọrọ m na oge amụrụ m akpata gbara m, mana ha amataghị na ọ bụ akpata. Ha kpọọrọ m gaa ebe a na-agba ọgwụ, ebe a chọrọ ịgwọ m, ha agbaa m ọgwụ, ọgwụ ahụ etinye m n'ọnọdụ a m nọ n'ime ya."
Ọla ndị m ritere akarịala, ha niile juru n'imeụlọ m. Ọ bụ egbe ka m na-agba, 'fencing'. Ihe bara uru na-eme na Legọs. Abụ m onye na-akụ bọọlụ nkata, ụnu maara m nke ọma. Kemgbe ka m na-akụ bọọlụ nkata, tupu m hụ nke a bụ 'fencing' a kpọrọ 'wheelchair fencing', m soro ha.
Ana m ekele Chineke mere m ji bụrụ otu onye n'ime ndị otu egwu Naịjirịa kpọ bịa njem a taa ịnọchite anya Naịjirịa ma mee ka ndị Naịjirịa chịa ọchị. Gị bụrụ onye nkwarụ a na-enyeghị ọrụ n'okpuru ọchịchị ime obodo, o nweghị ọrụ ị mụrụ, ịgba aka. O nweghị ihe a na-enye ha.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Agụụ, agụụ, ndị nkwarụ na-ata ahụhụ, ọ bụrụ na ọ bụghị ndị na-eme egwuruegwu. Amụọla m nwa mana enweghị m di. Ana m ata ahụhụ, ọ bụ maka nwa m ka m jiri gbapụta, si Imo Steeti bịa Legọs ka m chọọ ego m ga-eji zụọ nwa m. Ebe a m nọ, anyị na-asọ mpi.
Ọ malite, Chineke na-emere m amara etu o si emere m, m soro n'ime ya. Anaghị m agba onye ikpeazụ, aha m na-anọrịịrị ya. Etu ahụ aha m nọ ya, m sorokwa mee ya, aga m eso na ndị ga-emeri.
O nwee ihe ha chọrọ ịkwụ anyị, ha akwụọ. Aha m ga-esokwa na ndị a ga-akwụ ụgwọ. Anyị na ndị Oyibo nọ na-eme 'fencing'. Ihe a m bịara bụ egwuruegwu 'Commonwealth' maka 'wheelchair fencing', dịka m na-emekwa nke ọma. Emeriela m mmadụ abụọ mana m ka nwekwara ihe omume ndị ọzọ m ga-eme.