Ulọọrụ
na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ Economic and Financial
Crimes Commission maọbụ EFCC n’ịchafụ Bekee ekwuola na Naịjirịa eweghachitela ijeri
Naịra iri atọ ($24m; £19m) dịka akụkụ nnyocha a na-eme
mịnịsta akwụsịtụrụ ọrụ.
Ego ndị ahụ
ka enyopuru n’akpaego karịrị iri ise.
Mịnịsta
na-ahụ maka ọrụ obi ebere na mbelata ụbịam ọnụntụ bụ Betta Edu bụ onye akwụsịtụrụ ọrụ n’ọnwa Jenụwarị n’ihi ebubo itinye ego ọhanaeze dị $640,000 n’akpaego nke
onwe ya.
Onyeisiala
Tinubu nọọrọ mgbe ahụ nye iwu ka e mee nnyocha na mịnịstrị ya.
N’oge ahụ, Dr
Edu gbara afọ 37 gọrọ aka na ụkwụ ya n’ebubo nrụrụakaego ahụ e boro ya.
Ụlọọrụ ya
kwuru na o nyere nkwado ka akwụbanye ego n’akpaego nkịtị nke na-abụghị nke ya maka
‘ikesaara ndị ogbenye na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ.”
N’oge nnyocha ahụ fọdụrụ ihe ntakịrị ka o ruo izuụka isii, EFCC kwuru na ya achọtala ‘ọtụtụ akụkụ’
n’okwu ahụ nke ọ ga-enyocha.
“Ka ọ dị
ugbua, anyị na-enyocha akpaego karịrị iri ise anyị nyopuru ego ndị ahụ n'ime ya. Nke
ahụ abụghị egwu ụmụaka. Nke ahụ bụ nnukwu ihe,” ya ka onyeisioche EFCC bụ Ola
Olukoyede kwuru n’ozi ụlọọrụ ya wepụtara na nso nso a.
Ọ gwara ụmụafọ
Naịjirịa ndị na-achọ iti aka n’obi ka ha nye ụlọọrụ ya ohere ịpịakọta nnyocha
ha.
O kwuru sị “anyị
na-eleba anya n’ọtụtụ nchọpụta ndị anyị nwetara n'oge anyị na-eme nnyocha. Ya bụrụ
maka ịhụ ndị mmadụ n’ụlọmkpọrọ, ọ dị mma ka ha chere, ihe niile nwere usoro esi eme ya.”
Olukoyede sịrị
na ego ndị ahụ eweghachitere ‘abaalarị n’akpaego gọọmenti etiti Naịjirịa.”
Ịkwụsịtụ
onye mịnịsta ọrụ bụ ihe rara ahụ omume na Naịjirịa.