You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Gọọmentị Adamawa etinyela mmachi mkpagharị dịka ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri

Akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Julaị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ụtụtụ ọma

    Ụnụ asaala chi, ụmụ Igbo.

    Ka anyị malite mgbasaozi nke taa.

    Daalụ maka isonyere anyị.

  2. Ndewoonụ ndị be anyị

    Unu asaala chi?

    Nnọọ n'ọbaozi anyị

    Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

  3. Afọ juru m n'ihi na m mezuru nkwa m kwere nne m-Nwaada Chimaka Udehritela 'First Class' na mahadum na Rọshịa

    Nwaafọ Naijiria nwetara nturuugo onwaakwụkwọ kachasị mee ọfụma na ndị gụụ akwụkwọ maka ịbụ dọkịta Bekee na mahadum na Roshia egosipụtala afọ ojuju ya na nturuugo ahụ.

    Chiamaka Udeh nwetara 'First Class' na agụm akwụkwọ ịbụ dọkịta Bekee na mahadum 'Stavropol State Medical University' dị na Rọshịa.

    Nwaada Chiamaka gwara BBC igbo na mkparịtaụka n'ekwentị n'abalị Wenezde na , "Afọ juru na m emezuola nkwa m kwere nne m."

    " E gwara m nne m nkwa na m ga-enweta 'First Class, e mezuola m ya. Obi dị m ụtọ na emela ezinaụlọ m ihe ha ga-eji ama atụ."

    Cheta na n'ọnwa July afọ 2021, Chiamaka Victoria Udeh wuru ewu na soshal midia maka ife ọkọlọtọ Naijiria ọbara gburu n'asọmpi nwaanyị kachasị mma n'etiti ụmụakwụkwọ na mahadum Roshia iji kwanyere ndị nwụụ na oge ndị agha Naijiria kwara ndị na-eme ngaghariiwe mgbọ na Toll Gate Lekki Legọs.

  4. Otti etiela ndị ọkụ gbara ngwahịa ha ọkụ n’ahịa Ariaria aka n'obi

    Gọvanọ Abia steeti bụ Alex Otti etiela ndị ọkụ gbara ọdọahịa ha na ngwahịa ha n'ahị Arịarịa Aba aka n'obi.

    Ngwahịa ruru nde kwuru nde Naijiria gbara ọkụ n’ọgbọ akpụkpọụkwu n’ahịa Arịarịa Aba, n’Abịa steeti n'abalị Satode.

    N'ozi o wepụtara ụbọchị Wenezde, Otti kwuru na ya natara ozi ihe mere n’obi mwute.

    O kwuru na ya enyela kọmishọna na-ahụ maka azụmahia na steetio ahụ bụ Uche Ukeje ntuziaka ka ọ ga mata ka ihe sịrị kwụ n'ebe ọdachi ahụ mere iji mata etu a ga-esi tie ndị ahịa o metụtara aka n’obi ma chọpụta ụzọ igbochie ụdị ọdachi a ime n’ọdịniru.

    Otti gara n’ihu sị,” Ọrụ anyị bụ ichekwa ndụ na akụnaụba ndị be anyị “

  5. E gburu ihe karịrị mmadụ 800 n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche na Juun – Mpụtara nnyocha

    Otu ụlọọrụ ọkaibe n’ihe gbasara nchekwa nakwa amamihe na nchekwa bụ Beacon Consulting kwuru nke a ma kọwa na ha nnyochapụtara ozi mwakpo 460 ebe ha chọpụtara maka akụkọ ntọrọ ruru 239.

    Mwakpo ndị a dịka ha siri kwuo mere n’okpuruọchịchị 234 dị n’ime Naịjirịa gburugburu gụnyere Abuja.

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu kwere nkwa ịhụ na ikwalite nchekwa ga-eso n’isi sekpụ ntị ọrụ ya mana n’ọnwa nke mbụ ọrụ ya malitere, ọtụtụ akụkọ mwakpo adapụtala n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

    Agbanyeghi na ọchịchị ya eweela ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ n’ọrụ, a ka na-achọ ụzọ iji dajụọ mwakpo n’aka ndịagha nnupụisi ụka alakụba, ndị ekperima ‘bandits’ nakwa ọtụtụ ndị omekome na ndị ojiegbe ndị ọzọ na Naịjịrịa.

    N’ụbọchị Satọdee nke izuụka gara aga, e gburu ihe ruru mmadụ 40 n’akụkụ mpaghara etiti Naịjirịa gụnyere ọtụtụ obodo na Benue nakwa Plateau steeti.

    Ndị uweojii Benue steeti gwara BBC na a ka na-achọpụta ozu ndị mmadụ nwụrụ na mwakpo ndị a ruo ugbua.

  6. Ndị be anyị ndeeownụ!

    Nnọọ n'ọbaozi anyị taa bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Jụlaị, 2023.

    Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

  7. Ndị ohi ezurula ọkụ na-adị n'okporo ụgbọelu n'ọdọụgbọelu Legọs

    Ndị ohi ezurula ọkụ e tinyere n'okporo ụgbọelu nke ọdọụgbọelu Murtala Muhammed dị na Legọs, dịka ndị na-elekọta ọdọụgbọelu ahụ si gwa BBC.

    Yakubu Funtua bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba 'Federal Airports Authority' nke Naịjirịa (FAAN) kwuru na ha amalitela nnyocha iji chọpụta ndị zuru ohi a, napụta ha ihe ha zuuru ma nye ha ntaramahụhụ kwesịrị ha.

    O dochabeghị anya kpọmkwem mgbe e ji zupu ọkụ a n'ọdọụgbọelu ahụ, bụ nke e tinyere naanị n'ọnwa Nọvemba gara aga.

    Ọ bụ ọkụ a na-enyere ụgbọelu aka ịda n'ọdọụgbọelu ahụ n'abalị. Tupu e tinye ya bụ ọkụ, ụgbọelu anaghị enweike ịda na mpaghara okporoụgbọelu nke ndị si Naịjirịa, kama ha na-ada na mpaghara ebe ụgbọelu ndị si mba ofesi na-ada, bịa gbazie ihe karịrị kilomita anọ n'ala iji rute ebe ha kesịrị ịkwụsị, nke a kpatara ụfọdụ ihe nhịahụ n'ụgbọelu ida n'ọdọụgbọelu Legọs n'oge gara aga.

    Fubtua gwara BBC na e mechiburu mpaghara okporo ụgbọelu ahụ ihe ruru ọnwa olemole iji rụọ ọrụ na ya, mana ndị ekperima ji ohere ahụ gaa zupu ọkụ e tinyere ebe ahụ.

    Mana o kwere nkwa na ha ga-akpachi ohere niile ndị ekperima ahụ ji zuo ohi a iji gbochie ụdị ihe dị etu a imekwa ọzọ n'ọdịnihu.

    O kwuru na ọ bụ ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ n'ọdọ ụgbọelu ahụ na ụfọdụ ndị ekperima si n'iro jikọrọ aka ọnụ iji zuo ohi a.

  8. Ndị ojiegbe atọrọla otu ụkọchukwu Katọlik, mmadụ atọ ọzọ, n'Ebonyi Steeti

    Ndị ojiegbe awakpola obodo Isu nke dị n'okpuru ọchịchị Ọnịcha, n'Ebonyi Steeti, tọrọ mmadụ anọ, otu n'ime ha bụ ụkọchukwu Katọlik aha ya bụ Joseph Azubuike.

    Akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ụka Katọlik, dayọsis nke Abakiliki, bụ Fr Uzoma Opoke, kwuru na mwakpo a mere n'ụbọchị Mọnde, Julaị 10.

    Joseph Azubuike bụ ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka 'St Charles' dị na Mgbalaeze Isu. Ndị ntọ a jidere ya dịka ọ na-alaghachi n'ụlọụka ya ma kpụrụ ya na mmadụ atọ ọzọ tinye isi n'ọhịa.

    "Ndị ntọ ahụ ekwuola ego ole ha chọrọ ka a kwụọ ha, mana site n'enyemaka ekpere nke ọha mmadụ, anyị nwere olileanya na a ga-atọhapụ ya na-anaghị ihe ọbụla, Fr Opoke kwuru n'akwụkwọ ozi ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Onome Onovwakpoyeya gwara onye ntaakụkọ anyị na ha enwetabeghị ozi gbasara mwakpo a merenụ.

    Mana ọ kọrọ etu ndị uweojii si buso ụfọdụ ndị ekperima na-eyi ndị mmadụ egwu n'Ebonyi steeti agha, ma gbuo otu n'ime ha.

    O kwuru na ọ bụ na mpaghara Okposi ka ndị ekperima ahụ bu uzo wakpo ndị mmadụ tupu ha emechaa banye obodo Uburu ebe ha mekwara mwakpo ọzọ n'ụbọchị Mọnde.

    "Oge ndị uweojii nwetara ozi a, ha gbagara n'obodo ebe mwakpo ahụ mere wee buso ndị ekperima ahụ agha, otu onye n'ime ndị ojiegbe ahụ nwụrụ dịka ha na ndị uweojii na-akwarịta mgbọ, ebe ndị ọzọ bu mgbọ egbe tụrụ ha gbaa ọsọ," Onovwakpoyeya kwuru.

    Mwakpo a na-abịa dịka abalị olemole gachara ndị uweojii sị na ha ejichiela ndị ekperima 15 bụ ndị so eyi ndị mmadụ egwu n'Ebonyi ma na-amanyekwa iwu 'sit-at-home'.

    Mwakpo ndị ojiegbe dị ka ọ na-akawanye njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, bụ nke ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra, a na-akpọ Ipob n'ịchafụ, na-akpata ya.

    Mana Ipob agọọla ugboro ugboro na ọ bụghị ha.

  9. Nnọọnụ

    Ndị be anyị unu asaala chi taa bụ ụbọchị Tuzde, 11 Jụlaị, 2023?

    Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

    Daalụkwanụ!

  10. Otoro agbagbuola ihe na-achọzị iru mmadụ 50 na South Africa

    Ndị ọrụ ahụike na South Africa na-adọ ndị bi na mpaghara Gauteng aka na ntị ka ha kpachapụ anya maka mmiri ha na-aṅụ dịka ọnụọgụgụ ndị nwụrụla site n’ọrịa otoro na-agbasa ebe ahụ ariela elu na-achọ iru 50.

    Ndị otu ndị obodo ịd iche iche arịọla ka gọọmentị tinyekwuo aka iji kwalite ịnwe mmiri ebe ahụ.

    Ọtụtụ n'ime ndị nwụrụ n’aka ọrịa a n'ime izu isii gara aga nwụrụ na mpaghara Hammanskraal, ebe ndị bi ebe ahụ na-ekwu na enweghị mmiri dị ọcha bụ ihe ha na-agabiga kemgbe izu olemole mana enwekwaala akụkọ otoro ndị ọzọ dapụtara ebe ndị ọzọ.

    N'ọtụtụ ebe, mmiri pọmpụ anaghị adị ọcha dịka ndị mmadụ na-adabere na mmiri gọọmentị na-eji udu ebubata.

    Ọrịa otoro bụ nke nri na mmiri meruru emeru na-ebutekarị na-akpatara ọtụtụ oke afọ ọsịsa na ịgbọ agbọ dịka ya bụ ihe nwereike egbukwa ndị ọ na-arịa n'ime awa olemole ma ọ bụrụ na o bu ya anaghị ọgwụgwọ ngwa ngwa.

  11. China kindergarten stabbing: Mmadụ asaa anwụola na mwakpo ụlọakwụkwọ ọtaakara Lianjiang

    Mmadụ asaa anwụọla nke gụnyere ụmụaka anwụọla n’ụlọakwụkwọ ọtaakara ebe a sụrụ ndị mmadụ mma n’akụkụ ndịda China bụ mpaghara Guangdong.

    Ndị uweojii na-ekwu na ha anwụchila otu nwoke dị afọ 25 nke aha nna ya bụ Wu n’obodo Lianjiang.

    Ndị ọzọ a zụgburu n’ụlọakwụk,wọ a gụnyere otu onye nkuzi, na nne na nna abụọ dịka ụlọ ntaakụkọ AFP siri kwuo dịka ha kọwara na ọ bụ otu onye ọchịchị mba ahụ gbara ama nke a.

    E kwukwara na otu onye merụrụ ahụ na mwakpo a.

    Ndị uweojii kọwara na ihe bụ mwakpo “a ma ụma mee” mana ha akọwabeghi kpọm kwem ebumnobi onye mere ya bụ mwakpo.

    Mwakpo a mere n’isi ụtụtụ Mọnde a n’ebe elekere asaa na nkeji 40 nke ụtụtụ dịka ndị nne na nna nọ na-ebubu ụmụ ha n’ime ụlọakwụkwọ. A nwụchiri ya bụ nwoke a na-enyo n’okwu a n’ebe elekere asatọ nke ụtụtụ a.

    Ndị bi n’obodo Lianjiang ruru otu nde na ụma.

    Dịka ihe onyonyo banyere mwakpo a na-efesa na soshal midia China, ọtụtụ egosila iwe ha ebe ndị ọzọ na-ama jijiji.

    Nke a so ụdịrị mwakpo malitere iri elu na nso nso na mba a bụ mwakpo ịsụ mma dịka a machiri ndị nkiti ibu egbe na mba ahụ.

    Chetakwa na nso nso a, otu onye wakporo otu ụlọakwụkwọ ma gbaa ụmụakwụkwọ ruru 50 tụsa tụsa kemịkal nke merụrụ ha ahụ.

    Ngụkọ BBC egosila na mwakpo e ji mma mee ruru 17 emeela n’ọtụtụ ụlọakwụkwọ prịmarị, sekọndịrị nakwa mahadum malite n’afọ 2010 ruo ugbua na mba ahụ.

    Iri n’ime ha mere n’agbata afọ 2018 ruo 2023.

    Ndị ọchịchị China na-agbasi mbọ ike ichekwa gburugburu ụlọakwụkwọ ha kemgbe 2010. N'afọ ahụ, Ministri nchekwa obodo gbara ndị ọchịchị obodo ume ka ha "kwụsie ike na mbuso agha" nye ndị na-eme mwakpo a iji hụ na e chekwara ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ.

    Mgbe mwakpo Eprel 2021 gasịrị, ministri agụmakwụkwọ mba ahụ nyekwara iwu ka amalite ime ọzụzụ maka usoro mbupụ ụmụakwụkwọị n'ụlọ akwụkwọ ma ihe mberede mee.

    N'ịtụ egwu na mwakpo mpaghara ndị ọzọ ga-amụta agwa mwakpo a, mba China anaghị ekwe ka ụlọọrụ mgbasaozi ha bipụta akụkọ nkọwa zuruoke maka mwakpo Mọnde a mere n’ụlọakwụkwọ ọtaakara a

  12. Ndị ojiegbe agbaala ọtụtụ ọgbaa tum tum ọkụ n’Umuawuchi-Owerre, Imo steeti

    Ndị ojiegbe wakporo obodo Umuawuchi-Owerre nke okpuruọchịchị Ehime Mbano n’Imo steeti n’abalị Sọnde foro chi ụbọchị Mọnde a.

    A na-eche na ndị mere mwakpo a pụtara imanye iwu 'sit at home' na-aga n'ihu n'akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kemgbe otu izuụka.

    Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mwakpo mere n’akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjịrịa dị iche iche n’izu gara aga gụnyere Abia, Ebonyi, na Enugwu dịka onyendu otu alaka 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Simon Ekpa pụtara n’etiti ọnwa Julaị 2023, tie iwu maka mmachi mkpagharị ndị mmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ruo otu izuụka, iji kpọọ oku ka a tọhapụ onyendu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

    N’ihe onyonyo BBC hụrụ nke na-efegharị na soshal midia ọtụtụ ọgba tum tum na-agba ọkụ dịka olu onye na-ekwu okwu kọwara na ya bụ ihe “mere na be Obi, agbaala ọtụtụ ọgba tum tum ruru asatọ”

    Olu onye na-ekwu okwu n’ihe onyonyo ahụ kwukwara na ndị ojiegbe ahụ gbara ụgbọala ọhụrụ onye a a kpọrọ ‘Obi’ zutara ọkụ.

    A kụsiri ime ụlọahịa ya bụ nwoke dịka ndị olu na-ada n'ime ihe onyonyo ahụ nọ na-akwa arịrị.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo na ọ ga-ezighachite ozi banyere akụkọ a mana anyị ka na-eche ịnụ olu ya ruo ugbua.

    Ndị gọvanọ Steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kwuru na ha amachiela ọnọdụ 'sit-at-home' na mpaghara ahụ, ma kwukwaa na ha ga-enye ntaramahụhụ siri ike maka onye ọbụla rubere isi n'iwu ahụ.

    Kamgbe ahụ, ndị ekperima bucha egbe nọ na-akpagharị n'obodo dị icheiche, ma n'obodo ndị mepere emepe, ma n'ime obodo, na-awakpo ndị mmadụ pụtara ịgara mkpa ha.

  13. Ka ọ dị echi

    Anyị abịala n'isi njedebe mgbasaozi nke taa.

    Gụrụ gbadawa maka akụkọ niile dị mkpa maka ụbochị Sonde.

    Maka akụkọ ndị ọzọ, gaa na bbcigbo.com.

    Sonyekwara anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụtụtụ Mọnde.

    Ka chi fo.