"Mbuze eriela ọtụtụ ụlọ anyị" ndị bi n'okporụzọ Agu n'Aba, Abịa steeti

"Mbuze eriela ọtụtụ ụlọ anyị" ndị bi n'okporụzọ Agu n'Aba, Abịa steeti
    • Onye dere ya, Nnachi Orji
    • Ndị mere akụkọ a, Onye ntaakụkọ Vidio
    • Ebeg o si, Legọs
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Ntaakụkọ
  • Mgbe e biputara ya

Nnukwu idemmiri na mbuze mere n'Aba dị n'Abịa Steeti n'ọnwa Julaị 2026.

Ka nnukwu mmiri zochara na-akwụsịghị akwụsị, ihe a metụtara ihe karịrị ụlọ iri abụọ, ebe ụlọ asatọ kụrụ n'ala n'akụkụ okporoụzọ Agu dị Aba, nke a mere ka ọtụtụ ndi mmadu ghahapụ ezinụlọ ha ma gbahapụ ụlọ obibi ha.

Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ihuigwe na Naịjirịa bụ NiMet dọrọ aka na ntị na mmalite afọ a, na Abịa Steeti ga-eso n'ebe mmiri ozuzo ga-ezo nke ukwuu n'afọ a.

Ha kwuru na mbuze a malitere ka na-arụ ọwammiri nke kwesiri iru n'osimiri Aba.

Ọnọdụ a mere ka idemmiri gbakọọ ebe ahụ ma malite igwu olulu.

Ugbua, ha na-akpọ oku ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka.

Kedụ ihe ndị gọọmenti na-eme maka mbuze a?

Na nzaghachi, onyeisi ụlọọrụ Greater Aba Development Authority bụ Uche Ukaeje gwara BBC na ọ bụ oke mmiri ozuzu na-egbochi ọrụ na-aga n'ihu na mpaghara ahụ ma kwuo na gọọmenti steeti Abia steeti na-agbambọ iji belata mmetụta idemmiri nwere n'ebe ndị bi n'ebe ahụ nọ.