You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere Onyeisiala Tinubu ji ọchọghị ka FBI na ndị ọzọ gosi akwụkwọ metụtara ebubo ibu ọgwụike
Ndị ọkaiwu Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola ihe mere onyeisiala Naịjirịa a jiri gbaa akwụkwọ n'ụlọikpe ka gọọmentị mba Amerịka ghara ịgba n'anwụ akwụkwọ metụtara ebubo na o buru ọgwụike.
Ọkaiwu ya bụ Chris Carmichael kwuru na nke a bụ maka ichekwa ikike dịịrị Tinubu na ọ bụghị ya ga-eme ka onye ọbụla kpebie na Onyeisiala kwetere na o mere mpụ.
Carmichael gwara BBC na a bịa n'ikpe na-aga n'ihu na mba Amerịka, na onyeisiala mere ihe dịka e si nye ya ndụmọdụ site n'ịgba mbọ ka a kwụsị ngalaba ikpe mba Amerịka bụ Department of Justice (DOJ), ndị nchekwa Federal Bureau of Investigation (FBI) na ngalaba ọgwụike Drug Enforcement Administration (DEA) iwepụta akwụkwọ ahụ nakwa ndị ọzọ a sị metụtara ya.
"Dịka onye ọzọ so n'ikpe na mba Amerịka, Onyeisiala Tinubu nwere ikike igosi ikike ruuru ya maọbụ hapụ ya," ka Carmichael kwuru. ọ gbakwụnyere "ọ bụrụ na onye a gbara akwụkwọ chọrọ ịhapụ ikike ruuru ya, nke ahụ agaala."
Ọkaiwu Tinubu kwuru nke a dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ oku ka a gbaa akwụkwọ ahụ n'anwụ site n'ebubo metụtara ibu ọgwụike nke na-eso onyeisiala Naịjirịa kamgbe ọtụtụ afọ.
Tinubu ekwuola ya ugboro ugboro na aka ya adịghị n'ịtụ mgbere ọgwụike, ma sị hoohaa na o nweghi ụlọikpe ọbụla na mba Amerịka mara ya ikpe maka ime mpụ.
Carmichael kwuru na ọ bụ ndị ọkaiwu onyeisiala nyere ndụmọdụ ka o tinye akwụkwọ igbochi mwepụta akwụkwọ iji chekwaa ikike dịịrị ya dịka iwu Amerịka si dị.
"Site na ndụmọdụ ndị ọkaiwu nyere, a gwara onyeisiala Tinubu ka o gosi ikike ya n'ụlọikpe dịka e si eme ndị nkịtị ọzọ nwere ikpe. Onyeisiala nabatara ndụmọdụ ahụ." Ka ọkaiwu kwuru.
Ikpe ahụ na-atụle ma ụlọọrụ mba Amerịka dịka DOJ, FBI na DEA ọ ga-agba akwụkwọ ahụ n'anwụ nke metụtara ihe mere n'oge gara a na-ahụtazi ka ihe nrụrịtaụka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa nakwa Amerịka.
Ụfọdụ ndị nkwa onyeisiala kwuru na ọ bụ n'ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị mere ndị mmadụ ji achọ ka ewepụta akwụkwọ ahụ n'ihu n'ọha ebe ndị ọzọ kwuru ka a gbaa ya n'anwụ maka ọdịmma ọha nakwa nkwụwa aka ọtọ.
Carmichael kwuru na okwu ahụ dị n'ụlọikpe ugbua, na ọ dịzi ọkaikpe n'aka ikpebi ma a ga-ewepụta akwụkwọ ahụ n'ihu ọha.
Kedụ ndị chọrọ ka a gbaa akwụkwọ a n'anwụ?
Na nso nso a, otu onye na-ahụ maka ikike dịịrị onye na mba Amerịka bụ Aaron Greenspan gbara akwụkwọ n'ụlọikpe megide ọtụtụ ụlọọrụ mba Amerịka ka enye ya ohere ịhụ akwụkwọ metụtara nnyocha ha mere banyere Tibubu.
Greenspan chọrọ akwụkwọ ndị FBI nwere banyere Tinubu, akwụkwọ FBI a kpọrọ Form 302 banyere ajụjụọnụ ha gbara ya n'afọ 1992 na 1993 nakwa nke gosiri na Tinubu hapụụrụ mba gọọmentị Amerịka ego dị puku narị dọla anọ na puku iri isii ($460,000).
Otu ụlọọrụ ọzọ n'Amerịka a kpọrọ Von Batten-Montague-York kwuru na oyendu Naịjirịa na-agbasi mbọ ike izo akwụkwọ metụtara ebubo ịtụ mgbere ọgwụike.
N'ozi ha wepụtara n'akara soshal midia X, ụlọọrụ a kwuru na onyeisiala gwara ụlọikpe ka o nye ụlọọrụ Amerịka iwu ka ha ghara iwepụta akwụkwọ ndị a, rụtụ aka na nke a metụtara ikike dịịrị ya.
N'ozi ha wepụtara na Sọnde, ha kwuru na FBI na DEA gosiri ụlọikpe akwụkwọ nnyocha ha mere banyere ebubo ịtụ mgbere ọgwụike nke metụtara Onyeisiala Tinubu.
Ha kwuru na ihe tụrụ n'anya bụ na nnyocha ahụ gosiri ibe akwụkwọ ruru 399 nke metụtara Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu.
"N'ime akwụkwọ ndị ahụ gụnyere nnyocha ịtụ mgbere ọgwụike nke metụtara ebe a na-esipụta ya, ịchekwa usoro e ji azụ ya, ndị akaebe nakwa ihe ndị ọzọ zoro ezo dgz," ka Von-Batten-Montague-York kwuru n'akara X.