NBA Draft 2020: Lee Ụmụafo Naịjirịa ahọpụtara isonye tụọ bọọlụ nkata NBA n'afọ a

Mgbe e biputara ya

Jordan Nwora, Isaac Okoro na ndị ọzọ esonyela na otu dị ukwu na bọọlụ nkata na mba Amerịka.

Jordan Nwora
Nkọwa foto, Jordan Nwora gbara afọ 22 abanyela n'otu Milwaukee Bucks. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Louisville ebe ọ gbaara bọọlụ nkata. O so na otu bọọlụ nkata nke Naịjirịa.
Precious Achiuwa nke otu Miami Heat họpụtara na NBA Draft 2020
Nkọwa foto, A mụrụ Precious Achiuwa na obodo Pọtakọt na Naịjirịa tupu ọ gawa mba Amerịka. Ọ dị afọ 21. O bu ụzọ mụta ịgba bọọlụ tupu ọ malite ịkụ bọolụ nkata. Ọ kubuorola otu Mahadum Memphis bọọlụ.
Onyeka Okongwu (dị oji) na onye otu ya
Nkọwa foto, Onyeka Okongwu dị naanị afọ 19 esonyela n'otu Atlanta Hawks na nkata bọọlụ. Nwanne ya nwoke bụ Nnamdi na-akụkwa bọọlụ nkata nwụrụ n'afọ 2014.
Isaac Okoro
Nkọwa foto, Isaac Okoro dị afọ 19 bụ onye amụrụ na Atlanta mba Amerịka. Otu họọrọ ya bụ Cleveland Cavaliers n'ọkwa 5. Tupu ọ banye ebe ahụ, ọ kụụrụ otu Auburn Tiger's bọọlụ.
Udoka Timothy Azubike
Nkọwa foto, A mụrụ Udoka Timothy Azubike na Naịjirịa. O bidoro ịkụ bọọlụ nkata mgbe ọ dị adị afọ 13. Ugbua o so n'otu Utah Jazz. Nna Udoka nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri na Naịjirịa tupu achọpụta ya ma malite ikụziri ya bọọlụ nkata
Ezekiel Tobechukwu Nnaji
Nkọwa foto, Otu Denver Nuggets bụ ndị họọrọ Ezekiel Tobechukwu 'Zeke' Nnaji. Zeke dị afọ 19 gbaara otu Arizona Wildcats mgbe ọ nọ na Mahadum. A mụrụ ya na Minneapolis na mba Amerịka